Asụsụ Igbo j.s.1

Welcome to your Asụsụ Igbo j.s.1

Regent college school of Science Third term exam for Jss1 Asusu Igbo

Gụọ agụmagụ a nke ọma ma zaa ajụjụ sọ ya

Nwatakịrị ọ bula kwesịrị ịlu ọlụ dịrị ya n’ezinaụlọ, ọ bụ ya kpatara ọ ji dị mkpa na nne na nna ọ bụla ga ebido n’oge nyebe ụmụ ha ezigbo ozụzụ. Otụtụ ụmụaka anaghị alụ ọlụ dịrị ha n’ezinaụlọ, sọọso ihe ha maara bụ oke egwuregwu. Nwata azụrụ nke ọma anaghị echefu ịlu olụ ya mgbe nile, nke ụfọdụ n’ime ha bụ; ịsa efere, ịza ụlọ, ichute mmiri na ịkpata nku. Nwatakịrị mechaa ihe ndị a nille, ọ gaa zuo ike, rie nri, ma guo akwụkwọ ya tupu ọ rahụ ụra. ụgbua ka aga ọhuta nwatakịrị a dịka onye nwere ezigbo ọzụzụ, Nne na Nna ya na ndi ezinaụlo ya nille ga-enwe obi ańụri ebe ọ nọ. nwata a ga-abụ nwa a ga-eji na-anya isi.

Zaa ajụjụ Ndịa

1. Orụ abua nwata kwesịrị irụ n’ezinulọ bụ ________________

2. Nwata a zụrụ nke ọma anaghị echefu _______________________

3. Gịnị bu agwa nwata anaghị arụ orụ dịrị ya n’ezinụlọ?____________________

4. Onye ọ dịrị izụ ụmụaka n’edemede a bụ ______________________

NKEJI NKE ABUA: UTOASUSU

5. ụzọ ndị Igbo sị egosipụta ole ihe dị ka a na-akpo_________________________

6. ụzọ e sị agbasa ozi ka o rute onye ọ bụla aka ka a na akpọ___________________

7. Kaowaa ilụ a; Isi kote ebu ọ gbaa ya

8. Uda egbe, ekwe, anwụrụ oku bu ụzo e si ezisa ozi n’ ụdi _________________

9. Ihe ọbụla mmadụ ji echicheya were chepụta ma dee ya edee bụ____________

10. Leta nkeonye na-ebu adresi ___________________

11. Ahịrị zuru oke ga-enweriri________________

12. E nwere agụmagụ ọdịnala na agụmagụ __________________

Gosiputa ụbara okwu a kara ihe n’okpụrụ

13. Nwatakịrị ahụ bịara be anyị taa

14. Ntimkpu na-egosi ka _______________ dị mmadụ

15. Ihe e bụ n’uche mgbe a na-ede edemede ka a na-akpọ_____________

16. Otu atụmatụ okwu m maara eji achọ edemede mma bu __________

17. E kere edemede odịnaala ụzọ ______________

18. Kedụ udi edemede leta ole e nwere n’igbo

19. Ndị igbo sị na “Akụ fechaa ọ dara ______________

20. Onye ọ dịrị iwa oji n’ala Igbo bụ _________________

NKEBI NKE ABUO: AJUO AZAA

1. Oji agbaghị ibe bụ oji _______________

2. Ahịa anọ ndi igbo nwere bụ________________, __________________, _____________________ na_____________________

3. Otu ọmenala e ji mara ndi igbo bụ __________________________

4. Abụ ndi mmadụ ji eme nganga ma ha na-atụ nya ka a na-akpọ_______________________

5. Mejuo ahịrị okwu a: onye ajụjụ anaghi efu____________________

6. Anya ka e ji ama:____________________

Tụgharịa ahiriokwu a ka ọ bụrụ ajụjụ;

7. Uju mara mma nwaanyi__________________________________

Depụta ihe ọnụọgụgụ ndi a pụtara:

8. 4,848 = ___________________________

9. 16,852=______________________________

10. Aha a kpọrọ edemede nkọwami na bekee bụ________________________

NKEJI NKE ATO:

Họrọ naani ajụjụ atọ n’ime ise ka I zaa

1a. Gịnị bụ edemede?

b. Kpọpụta ụdị edemede ise I maara

ch. Kpọpụta ihe atọ dị mkpa edemede ọ bụla kwesịrị ịnwe

2. Gịnị bụ nzịsa ozi?

b. Kpọpụta ụdị nzịsa ozi nke ọdịnaala anọ I maara

ch. Kpọpụtakwa ụdị nzisa ozi atọ nke ugbu a I maara

3a. Gịnị bụ ọnụọgụgụ?

b. Depụta ihe ọnụọgụgụ ndị a pụtara

i. 1/3 = ________________________________

ii. 2,000,100 = ________________________________

iii. 19,048 = _______________________________________

iv. Ntabi anya ole na-eme otu nkeji nke elekere ___________________________

v. Ahịa ole ka ndị Igbo nwere?___________________________

Ch. Dee ọnụọgụgụ ndịa na fịgọ

i. Puku iri ise na puku ise___________________________________

ii. Otu nde narị anọ na iri asaa____________________________

Nde abuọ na narị atọ ____________________________________

4a. Gịnị bu ụdaolu?

4b. Tinye akara udaolu n’okwu ndịa

i. Oke = (boundary)

ii. Oke =(male)

iii. Oke = (share)

iv. Oke = (rat)

4ch. Depụta ma gosịpụta akara ụdaolu ato e nwere n’asụsụ igbo

5. Dee edemede gbasara otu n’ime ndị a;

a. Idebe gburugburu ọcha

b. ụlọ akwụkwọ m

ch. Obodo m

d. Ezigbo enyi m

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *